Native Bible

Ezekiel 17:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?

Ezekiel 17:15 in English

Ezekiel 17:15 · Berean Standard Bible

But this king rebelled against Babylon by sending his envoys to Egypt to ask for horses and a large army. Will he flourish? Will the one who does such things escape? Can he break a covenant and yet escape?’

Context

13O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile. 14Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ. 15Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga? 16“ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya. 17Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.