Native Bible

Ezekiel 17:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile.

Ezekiel 17:13 in English

Ezekiel 17:13 · Berean Standard Bible

He took a member of the royal family * and made a covenant with him, putting him under oath. Then he carried away the leading men of the land,

Context

11Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 12“Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn. 13O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile. 14Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ. 15Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.