Native Bible

Ezekiel 16:62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị guzosie ike, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

Ezekiel 16:62 in English

Ezekiel 16:62 · Berean Standard Bible

So I will establish My covenant with you, and you will know that I am the LORD,

Context

60Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi. 61Mgbe ahụ, ị ga-echeta ụzọ gị niile, ma nwee ihere, mgbe m ga-ewere ụmụnne gị ndị inyom ndị ahụ tọrọ gị na ndị nke ị tọrọ nye gị ha dịka ụmụ, ma ọ bụghị nʼihi ọgbụgba ndụ m. 62Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị guzosie ike, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 63Mgbe ahụ, aga m ekpuchiri gị ajọ omume niile bụ nke ị mere. Ihere ga-eme gị mgbe i chetara ndụ ọjọọ gị, ị gaghị emeghekwa ọnụ gị kwuo okwu nʼihi oke mweda nʼala gị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ” 16:25 Ya bụ, eghebere 16:25 Na-enyekwa onye ọbụla onwe gị 16:30 Lee ka i si bụrụ onye na-ata ahụ, onye obi ya na-esighị ike. 16:30 Onye na-adịghị ezo-ezo maọbụ na-eme omume ọ dịghị onye m hụrụ 16:57 Ọtụtụ akwụkwọ mgbe ochie na-ede Aram 16:59 Ị kpachara anya mebie ọgbụgba ndụ nke mụ na gị gbara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.