Native Bible

Ezekiel 16:58 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ezekiel 16:58 in English

Ezekiel 16:58 · Berean Standard Bible

You will bear the consequences of your lewdness and your abominations, declares the LORD.

Context

56Ma ị pụghị emeghe ọnụ gị kpọọ aha nwanne gị nwanyị bụ Sọdọm nʼụbọchị nganga gị, 57tupu e kpughe ajọ omume gị. Ọ bụladị otu ahụ, ugbu a ị bụ ihe ịkwa emo nye ndị ada Edọm* na ndị agbataobi ya niile, na ndị ada ndị Filistia. Ndị niile nọ gị gburugburu na-elelịkwa gị anya. 58Ị ga-anata ụgwọ ọrụ nke ịkwa iko gị, na ihe arụ ndị ọzọ ị na-eme. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 59“ ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, nʼihi na ị ledara iyi ahụ ị ṅụrụ anya site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ.* 60Ma otu ọbụla o si dị, aga m edebezu nkwa ahụ niile m kwere gị mgbe ị dị na nwantakịrị. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ahụ dị nʼetiti mụ na gị guzosie ike ruo ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.