Izikiel 16:52
Ezekiel 16:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume.
Ezekiel 16:52 in English
Ezekiel 16:52 · Berean Standard Bible
So now you must bear your disgrace, since you have brought justification for your sisters. For they appear more righteous than you, because your sins were more vile than theirs. So you too must bear your shame and disgrace, since you have made your sisters appear righteous.
Context
50Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ. 51Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere. 52Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume. 53“ ‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha: 54Ka i nwee ike bụrụ ọnọdụ ihere gị, ka ihere mekwa gị nʼihi ihe niile i mere, nʼịkasị ha obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.