Izikiel 16:51
Ezekiel 16:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere.
Ezekiel 16:51 in English
Ezekiel 16:51 · Berean Standard Bible
Furthermore, Samaria did not commit half the sins you did. You have multiplied your abominations beyond theirs, and all the abominations you have committed have made your sisters appear righteous.
Context
49“ ‘Mmehie nwanne gị nwanyị Sọdọm bụ nganga, na umengwụ, na oke oriri. Ha jụrụ inyere ndị nọ na mkpa, na ndị agụụ na-agụ nọ nʼọnụ ụzọ ha aka. 50Ha dị elu nʼobi ha, mee ihe arụ nʼihu m. Nʼihi ya, esitere m nʼihu m wezuga ha dịka ị hụrụ. 51Ọ bụladị Sameria emerughị ọkara mmehie niile i mere. I meela ihe arụ bara ụba karịa nke ha mere, si otu a gụọ ụmụnne gị ndị inyom ka ndị ezi omume site nʼihe ndị a niile nke ị mere. 52Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume. 53“ ‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha:
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.