Native Bible

Ezekiel 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.

Ezekiel 16:3 in English

Ezekiel 16:3 · Berean Standard Bible

and tell her that this is what the Lord GOD says to Jerusalem: Your origin and your birth were in the land of the Canaanites. Your father was an Amorite and your mother a Hittite.

Context

1Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 2“Nwa nke mmadụ, gwa Jerusalem okwu mee ka ọ mara banyere ndụ ya niile rụrụ arụ 3sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het. 4Nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị, ebeghị otubo gị, ọ dịghị onye lekọtara gị maọbụ jiri mmiri saa gị ahụ ị sachapụ gị unyi maọbụ tee gị nnu, maọbụ jiri akwa kechie gị. 5Ọ dịghị onye nwere obi ebere nʼebe ị nọ. Ọ dịghị onye ihe banyere gị metụrụ nʼobi, ọ dịkwaghị onye lekọtara gị. Kama nʼụbọchị ahụ a mụrụ gị a tufuru gị nʼọhịa, nʼihi na-eledara gị anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.