Native Bible

Ezekiel 15:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, dịka m sitere nʼetiti ọhịa niile wepụta osisi vaịnị nye ka ọ bụrụ nkụ e ji emenye ọkụ, otu a ka m ga-esi mesoo ndị bi na Jerusalem.

Ezekiel 15:6 in English

Ezekiel 15:6 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the Lord GOD says: ‘Like the wood of the vine among the trees of the forest, which I have given to the fire for fuel, so I will give up the people of Jerusalem.

Context

4Uru ha bara bụ iji ha menye ọkụ. Ma mgbe isi ya abụọ repịara, mgbe etiti ya rekwara ọkụ, o nwere ihe ọzọ mmadụ nwere ike iji ya mee? 5Ọ bụrụ na ọ baghị uru mgbe o zuruoke, a ga-esi aṅa were ya mepụta ihe bara uru mgbe ọkụ repịasịrịla ya, ọ ghọọ unyi? 6“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, dịka m sitere nʼetiti ọhịa niile wepụta osisi vaịnị nye ka ọ bụrụ nkụ e ji emenye ọkụ, otu a ka m ga-esi mesoo ndị bi na Jerusalem. 7Aga m eche ihu m* imegide ha. Ọ bụ ezie na ha esitela nʼọkụ pụta, ma ọkụ ga-erepịa ha. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m guzoro onwe m megide ha. 8Aga m emekwa ka ala ha tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 15:7 Maọbụ, Aga m eguzo onwe m

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.