Native Bible

Ezekiel 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?

Ezekiel 13:7 in English

Ezekiel 13:7 · Berean Standard Bible

Haven’t you seen a false vision and spoken a lying divination when you proclaim, ‘Thus declares the LORD,’ even though I have not spoken?

Context

5Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị. 6Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha. 7Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu? 8“ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 9Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.