Native Bible

Ezekiel 11:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.

Ezekiel 11:22 in English

Ezekiel 11:22 · Berean Standard Bible

Then the cherubim, with the wheels beside them, spread their wings, and the glory of the God of Israel was above them.

Context

20Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 21Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.” 22Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha. 23Ebube Onyenwe anyị sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 24Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.