Native Bible

Ezekiel 11:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.

Ezekiel 11:20 in English

Ezekiel 11:20 · Berean Standard Bible

so that they may follow My statutes, keep My ordinances, and practice them. Then they will be My people, and I will be their God.

Context

18“Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ. 19Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ* nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ. 20Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 21Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.” 22Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.