Native Bible

Ezekiel 11:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 11:14 in English

Ezekiel 11:14 · Berean Standard Bible

Then the word of the LORD came to me, saying,

Context

12Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.” 13Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?” 14Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 15“Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta* gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’ 16“Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.