Izikiel 11:13
Ezekiel 11:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”
Ezekiel 11:13 in English
Ezekiel 11:13 · Berean Standard Bible
Now as I was prophesying, Pelatiah son of Benaiah died. Then I fell facedown and cried out in a loud voice, “Oh, Lord GOD, will You bring the remnant of Israel to a complete end?”
Context
11E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile. 12Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.” 13Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?” 14Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 15“Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta* gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.