Izikiel 10:8
Ezekiel 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ.
Ezekiel 10:8 in English
Ezekiel 10:8 · Berean Standard Bible
(The cherubim appeared to have the form of human hands under their wings.)
Context
6Mgbe Onyenwe anyị nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ. 7Mgbe ahụ, otu nʼime ndị cherubim ahụ setịpụrụ aka ya nʼebe ọkụ ahụ dị nʼetiti ha. Ọ gụtara ụfọdụ icheku ọkụ tinye nʼaka nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha onye weere ya pụọ. 8Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ. 9Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril. 10Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.