Izikiel 1:16
Ezekiel 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril* kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu.
Ezekiel 1:16 in English
Ezekiel 1:16 · Berean Standard Bible
The workmanship of the wheels looked like the gleam of beryl, and all four had the same likeness. Their workmanship looked like a wheel within a wheel.
Context
14Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu. 15Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya. 16Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril* kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu. 17Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga. 18Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.