Ọpụpụ 9:5
Exodus 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”
Exodus 9:5 in English
Exodus 9:5 · Berean Standard Bible
The LORD set a time, saying, “Tomorrow the LORD will do this in the land.”
Context
3aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu. 4Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ” 5Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.” 6Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. 7Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.