Native Bible

Exodus 8:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.

Exodus 8:15 in English

Exodus 8:15 · Berean Standard Bible

When Pharaoh saw that there was relief, however, he hardened * his heart and would not listen to Moses and Aaron, just as the LORD had said.

Context

13Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa. 14E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu. 15Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme. 16Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.” 17Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.