Ọpụpụ 8:14
Exodus 8:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.
Exodus 8:14 in English
Exodus 8:14 · Berean Standard Bible
They were piled into countless heaps, and there was a terrible stench in the land.
Context
12Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero. 13Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa. 14E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu. 15Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme. 16Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.