Ọpụpụ 7:20
Exodus 7:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara.
Exodus 7:20 in English
Exodus 7:20 · Berean Standard Bible
Moses and Aaron did just as the LORD had commanded; in the presence of Pharaoh and his officials, Aaron raised the staff * and struck the water of the Nile, and all the water was turned to blood.
Context
18Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’ ” 19Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.” 20Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara. 21Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile. 22Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara.* Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.