Ọpụpụ 7:19
Exodus 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.”
Exodus 7:19 in English
Exodus 7:19 · Berean Standard Bible
And the LORD said to Moses, “Tell Aaron, ‘Take your staff and stretch out your hand over the waters of Egypt—over their rivers and canals and ponds and reservoirs—that they may become blood.’ There will be blood throughout the land of Egypt, even in the vessels of wood and stone.”
Context
17Ugbu a Onyenwe anyị kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara. 18Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’ ” 19Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.” 20Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara. 21Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.