Ọpụpụ 7:13
Exodus 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.
Exodus 7:13 in English
Exodus 7:13 · Berean Standard Bible
Still, Pharaoh’s heart was hardened,* and he would not listen to them, just as the LORD had said.
Context
11Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. 12Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ. 13Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru. 14Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa. 15Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri.* Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.