Ọpụpụ 7:11
Exodus 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha.
Exodus 7:11 in English
Exodus 7:11 · Berean Standard Bible
But Pharaoh called the wise men and sorcerers and magicians of Egypt, and they also did the same things by their magic arts.
Context
9“Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.” 10Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. 11Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. 12Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ. 13Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.