Ọpụpụ 6:9
Exodus 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
Exodus 6:9 in English
Exodus 6:9 · Berean Standard Bible
Moses relayed this message to the Israelites, but on account of their broken spirit and cruel bondage, they did not listen to him.
Context
7Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt. 8Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’ ” 9Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha. 10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị, 11“Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.