Native Bible

Exodus 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.

Exodus 6:7 in English

Exodus 6:7 · Berean Standard Bible

I will take you as My own people, and I will be your God. Then you will know that I am the LORD your God, who brought you out from under the yoke of the Egyptians.

Context

5Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m. 6“Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu. 7Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt. 8Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’ ” 9Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.