Native Bible

Exodus 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Exodus 6:2 in English

Exodus 6:2 · Berean Standard Bible

God also told Moses, “I am the LORD.

Context

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.” 2Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” 3Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị. 4Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.