Native Bible

Exodus 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”

Exodus 5:4 in English

Exodus 5:4 · Berean Standard Bible

But the king of Egypt said to them, “Moses and Aaron, why do you draw the people away from their work? Get back to your labor!”

Context

2Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.” 3Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ* nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.” 4Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!” 5Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.” 6Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta* ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.