Native Bible

Exodus 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”

Exodus 5:16 in English

Exodus 5:16 · Berean Standard Bible

No straw has been given to your servants, yet we are told, ‘Make bricks!’ Look, your servants are being beaten, but the fault is with your own people.”

Context

14Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?” 15Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso? 16Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.” 17Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’ 18Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.