Ọpụpụ 40:8
Exodus 40:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.
Exodus 40:8 in English
Exodus 40:8 · Berean Standard Bible
Set up the surrounding courtyard and hang the curtain for the entrance to the courtyard.
Context
6“Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ. 7Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri. 8Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ. 9“Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ. 10Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.