Native Bible

Exodus 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”

Exodus 4:9 in English

Exodus 4:9 · Berean Standard Bible

But if they do not believe even these two signs or listen to your voice, take some water from the Nile and pour it on the dry ground. Then the water you take from the Nile will become blood on the ground.”

Context

7Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ. 8Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a. 9Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.” 10Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.” 11Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.