Ọpụpụ 4:10
Exodus 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”
Exodus 4:10 in English
Exodus 4:10 · Berean Standard Bible
“Please, Lord,” Moses replied, “I have never been eloquent, neither in the past nor since You have spoken to Your servant, for I am slow of speech and tongue.”
Context
8Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a. 9Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.” 10Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.” 11Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị? 12Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.