Ọpụpụ 4:26
Exodus 4:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.)
Exodus 4:26 in English
Exodus 4:26 · Berean Standard Bible
So the LORD let him alone. (When she said, “bridegroom of blood,” she was referring to the circumcision.)
Context
24Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Mosis chọọ igbu ya. 25Ma Zipọra nwunye Mosis weere mma ntakịrị bie nwa ya ugwu. O were ihe o bipụtara nʼugwu a metụ nʼụkwụ Mosis, kwuo sị, “Nʼezie, ị bụ di ọbara nʼebe m nọ.” 26Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.) 27Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ. 28Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile Onyenwe anyị ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.