Native Bible

Exodus 39:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ

Exodus 39:40 in English

Exodus 39:40 · Berean Standard Bible

the curtains of the courtyard with its posts and bases; the curtain for the gate of the courtyard, its ropes and tent pegs, and all the equipment for the service of the tabernacle, the Tent of Meeting;

Context

38na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute, 39na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya, 40akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ 41na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja. 42Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.