Native Bible

Exodus 36:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.

Exodus 36:14 in English

Exodus 36:14 · Berean Standard Bible

He then made curtains of goat hair for the tent over the tabernacle—eleven curtains in all.

Context

12Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu. 13Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu. 14Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ. 15Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ. 16Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.