Native Bible

Exodus 36:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.

Exodus 36:13 in English

Exodus 36:13 · Berean Standard Bible

He also made fifty gold clasps to join the curtains together, so that the tabernacle was a unit.

Context

11Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. 12Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu. 13Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu. 14Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ. 15Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.