Native Bible

Exodus 35:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.”

Exodus 35:3 in English

Exodus 35:3 · Berean Standard Bible

Do not light a fire in any of your dwellings on the Sabbath day.”

Context

1Emesịa, Mosis kpọrọ nzukọ ụmụ Izrel niile gwa ha sị, “Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere nke unu na-aghaghị idebe. 2Rụọnụ ọrụ ụbọchị isii, ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike, ụbọchị dị nsọ nke izuike nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị nke asaa ga-anwụ. 3Unu amụnyela ọkụ nʼebe obibi unu nʼụbọchị izuike ahụ.” 4Mgbe ahụ Mosis gwara nzukọ Izrel niile sị, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, 5sitenụ nʼihe unu nwere wetara Onyenwe anyị onyinye. Onye ọbụla nke ọ masịrị, ya wetara Onyenwe anyị onyinye nke ihe ndị a: “Ọlaọcha, ọlaedo na bronz,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.