Ọpụpụ 34:11
Exodus 34:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus.
Exodus 34:11 in English
Exodus 34:11 · Berean Standard Bible
Observe what I command you this day. I will drive out before you the Amorites, Canaanites, Hittites, Perizzites, Hivites, and Jebusites.
Context
9sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.” 10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu. 11Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus. 12Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu. 13Kama, tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha jiri mere chi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.