Ọpụpụ 32:15
Exodus 32:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ.
Exodus 32:15 in English
Exodus 32:15 · Berean Standard Bible
Then Moses turned and went down the mountain with the two tablets of the Testimony in his hands. They were inscribed on both sides, front and back.
Context
13Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 14Ya mere, Onyenwe anyị gbanwere obi ya. Ọ lakwaghị ha nʼiyi. 15Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ. 16Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akaọrụ Chineke, ihe e dere nʼelu ha bụ ihe Chineke nʼonwe ya dekwasịrị nʼelu mbadamba nkume ndị ahụ. 17Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.