Ọpụpụ 29:24
Exodus 29:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
Exodus 29:24 in English
Exodus 29:24 · Berean Standard Bible
Put all these in the hands of Aaron and his sons and wave them before the LORD as a wave offering.
Context
22“Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ), 23site na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke na-adị nʼihu Onyenwe anyị. Were otu achịcha dị gburugburu, otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, 24tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. 25Mgbe ahụ, nara ha site nʼaka ha. Kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha na aja nsure ọkụ, ka ọ bụrụ ihe isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. Onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. 26Mgbe i wepụtara obi ebule ahụ e ji doo Erọn nsọ, fufee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ọ ga-abụkwa oke nke gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.