Ọpụpụ 29:22
Exodus 29:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ),
Exodus 29:22 in English
Exodus 29:22 · Berean Standard Bible
Take the fat from the ram, the fat tail, the fat covering the entrails, the lobe of the liver, both kidneys with the fat on them, and the right thigh (since this is a ram for ordination),
Context
20Gbuo ya. Were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn na ụmụ ya nʼọnụ ntị aka nri ha, na isi mkpụrụ aka nke aka nri ha, ya na isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ha. Werekwa ọbara nke fọdụrụ fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja ahụ. 21Ị ga-esite nʼelu ebe ịchụ aja were ụfọdụ ọbara, ya na ụfọdụ mmanụ nsọ, fesa ya nʼahụ Erọn na nʼelu uwe ya, nʼahụ ụmụ ya ndị ikom, nakwa nʼelu uwe ha niile. Mgbe ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom ga-abụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ha na uwe ha. 22“Were abụba ebule ahụ, na akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba nke kpuchiri ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba gbara ha gburugburu, na apata aka nri ya (nʼihi na ebule ahụ bụ ebule ido nsọ), 23site na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke na-adị nʼihu Onyenwe anyị. Were otu achịcha dị gburugburu, otu ogbe achịcha a gwakọtara mmanụ oliv, na otu mbadamba ogbe achịcha, 24tinye ihe ndị a niile nʼaka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, mee ka ha fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.