Native Bible

Exodus 28:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere.

Exodus 28:42 in English

Exodus 28:42 · Berean Standard Bible

Make linen undergarments to cover their bare flesh, extending from waist to thigh.

Context

40Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ. 41Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. 42“Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere. 43Erọn na ụmụ ya ndị ikom aghaghị iyi ha mgbe niile ha ga-aba nʼime ụlọ nzute, maọbụ mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja ije ozi nʼEbe Nsọ. Ka ha ghara imeta ihe ikpe ọmụma, ma nwụọ. “Nke a ga-abụ iwu na ụkpụrụ ebighị ebi, nke ga-adịrị Erọn na ụmụ ụmụ ya. 28:30 Urim na Tumim bụ nkume e ji ajụta ase, na ntụziaka site nʼebe Chineke nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.