Native Bible

Exodus 28:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.

Exodus 28:31 in English

Exodus 28:31 · Berean Standard Bible

You are to make the robe of the ephod entirely of blue cloth,

Context

29“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile. 30Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim.* Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị. 31“Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ. 32Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka. 33Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.