Ọpụpụ 28:29
Exodus 28:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.
Exodus 28:29 in English
Exodus 28:29 · Berean Standard Bible
Whenever Aaron enters the Holy Place, he shall bear the names of the sons of Israel over his heart on the breastpiece of judgment, as a continual reminder before the LORD.
Context
27Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ. 28A ga-eji eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọtaa ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ ghara ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ. 29“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile. 30Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim.* Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị. 31“Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.