Ọpụpụ 28:2
Exodus 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ.
Exodus 28:2 in English
Exodus 28:2 · Berean Standard Bible
Make holy garments for your brother Aaron, to give him glory and splendor.
Context
1“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel kpọbata nwanne gị nwoke Erọn, ya na ụmụ ya ndị ikom, bụ Nadab, na Abihu, na Elieza na Itama. Ka ha jeere m ozi dịka ndị nchụaja. 2Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ. 3Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja. 4Nke a bụ ụdị uwe ha ga-adụ: Ihe mgbochi obi, efọọd, uwe ime ahụ akpara akpa na-enweghị aka na uwe mwụda buru ibu, na uwe ime ahụ nke tụrụ agwa agwa na akwa a na-atụhị nʼisi na nke a na-eke nʼukwu. Ha ga-adụrụ Erọn nwanne gị nwoke na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a dị nsọ. Ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.