Ọpụpụ 26:20
Exodus 26:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ.
Exodus 26:20 in English
Exodus 26:20 · Berean Standard Bible
For the second side of the tabernacle, the north side, make twenty frames
Context
18Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ. 19Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ. 20Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ. 21Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla. 22Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.