Native Bible

Exodus 24:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ.

Exodus 24:17 in English

Exodus 24:17 · Berean Standard Bible

And the sight of the glory of the LORD was like a consuming fire on the mountaintop in the eyes of the Israelites.

Context

15Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile, 16ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku. 17Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ. 18Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.