Native Bible

Exodus 24:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku.

Exodus 24:16 in English

Exodus 24:16 · Berean Standard Bible

and the glory of the LORD settled on Mount Sinai. For six days the cloud covered it, and on the seventh day the LORD called to Moses from within the cloud.

Context

14Ọ gwara ndị okenye Izrel okwu sị, “Cherenụ anyị nʼebe a tutu ruo mgbe anyị ga-alaghachikwute unu. Unu na Erọn na Hua nọ, onye ọbụla nwere nsogbu jekwuru ha.” 15Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile, 16ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku. 17Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ. 18Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.