Native Bible

Exodus 23:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ.

Exodus 23:4 in English

Exodus 23:4 · Berean Standard Bible

If you encounter your enemy’s stray ox or donkey, you must return it to him.

Context

2“Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi. 3Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye. 4“Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ. 5Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ. 6“Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.