Native Bible

Exodus 23:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.

Exodus 23:31 in English

Exodus 23:31 · Berean Standard Bible

And I will establish your borders from the Red Sea * to the Sea of the Philistines, and from the desert to the Euphrates.* For I will deliver the inhabitants into your hand, and you will drive them out before you.

Context

29Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu. 30Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile. 31“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha. 32Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla. 33Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.” 23:16 Aha ọzọ a na-akpọ mmemme owuwe ihe ubi bụ mmemme Izu, gụọ ya nʼakwụkwọ Ọpụ 34:22, nʼihi na ọ bụ izu asaa, mgbe Mmemme Ngabiga gafesịrị ka a na-eme ya. Ọ bụkwa nʼọgwụgwụ owuwe ihe ubi. 23:16 Mmemme nchịkọta mkpụrụ bụ ihe na-egosi na e wechaala ihe ubi. Dit 16:13 23:18 Ya bụ chi ọbụbọ 23:19 Otu nʼime omenaala dị nʼusoro ofufe ndị Kenan bụ isi nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya. Dit 14:21 23:24 Ebe a manyere ogidi, ka e ji amata ebe bụ ebe ịchụ aja ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.