Ọpụpụ 22:27
Exodus 22:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere.
Exodus 22:27 in English
Exodus 22:27 · Berean Standard Bible
because his cloak is the only covering he has for his body. What else will he sleep in? And if he cries out to Me, I will hear, for I am compassionate.
Context
25“Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa. 26Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara. 27Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere. 28“Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ. 29“Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ.
“Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.