Ọpụpụ 21:24
Exodus 21:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ.
Exodus 21:24 in English
Exodus 21:24 · Berean Standard Bible
eye for eye, tooth for tooth,* hand for hand, foot for foot,
Context
22“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri. 23Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ. 24Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ. 25Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti. 26“Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.